Job 21:9
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-ebi ndụ udo nʼezinaụlọ ha na-atụghị egwu na ihe ọjọọ ọbụla ga-adakwasị ha; mkpara Chineke adịghịkwa adakwasị ha.
Job 21:9 in English
Job 21:9 · Berean Standard Bible
Their homes are safe from fear; no rod of punishment from God is upon them.
Context
7Gịnị mere ndị ajọ omume ji enwe ndụ ogologo,
ghọọ okenye, baakwa ụba nʼịdị ike? 8Ha na-ahụ ụmụ ka ha na-akwụsike ike gburugburu ha,
ụmụ ha ka ha ji anya ha ahụ. 9Ha na-ebi ndụ udo nʼezinaụlọ ha na-atụghị egwu na ihe ọjọọ ọbụla ga-adakwasị ha;
mkpara Chineke adịghịkwa adakwasị ha. 10Oke ehi ha na-agba nne ehi ha na-esepụghị aka;
nne ehi ha na-amụ ụmụ, ha adịghị ekwo ime. 11Ha na-ezipụ ụmụ ha dịka igwe atụrụ;
ụmụntakịrị ha na-etegharị egwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.