Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị na-elegide onye dị otu a anya? Ị ga-akpọ ya ikpe nʼihu gị?

Job 14:3 in English

Job 14:3 · Berean Standard Bible

Do You open Your eyes to one like this? Will You bring him into judgment before You?

Context

1“Mmadụ nke nwanyị mụrụ nwere ụbọchị ole na ole nke jupụtara na nsogbu. 2Ọ na-awalite dịka okoko osisi, ma kpọnwụọkwa mgbe na-adịghị anya, dịka onyinyo, ọ na-agabiga agabiga. 3Ị na-elegide onye dị otu a anya? Ị ga-akpọ ya ikpe nʼihu gị? 4Onye pụrụ iwepụta ihe dị ọcha site nʼihe na-adịghị ọcha? Ọ dịghị onye ọ bụ. 5Ị kpebiela ụbọchị ndụ nke mmadụ; ị kabiela ọnụọgụgụ nke ọnwa ya niile, kpaakwa oke ebe ọ na-agaghị agabiga.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.