Job 14:13
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“A sị na ị ga-ezo m nʼala mmụọ, na ị ga-ezobe m tutu ruo mgbe iwe gị gabigara. A sị na ị ga-akanyere m oge ma mesịa cheta m.
Job 14:13 in English
Job 14:13 · Berean Standard Bible
If only You would hide me in Sheol and conceal me until Your anger has passed! If only You would appoint a time for me and then remember me!
Context
11Dịka mmiri dị nʼoke osimiri si ata,
maọbụ ka mmiri dị nʼiyi si ata nʼoge ọkọchị, 12otu a ka mmadụ si e dinaa ma ọ dịghị etetakwa ọzọ;
tutu ruo mgbe eluigwe na-agaghị adịkwa; mmadụ ọbụla apụghị i si nʼụra kpọtee ya,
agaghị akpọtekwa ha site nʼụra ha. 13“A sị na ị ga-ezo m nʼala mmụọ,
na ị ga-ezobe m tutu ruo mgbe iwe gị gabigara.
A sị na ị ga-akanyere m oge
ma mesịa cheta m. 14Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ?
Ụbọchị niile nke ọrụ ahụhụ m,
aga m echere mgbe nnapụta m ga-abịa. 15Ị ga-akpọ, aga m azakwa gị,
agụụ ọrụ aka gị ga-agụ gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.