Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

otu a ka mmadụ si e dinaa ma ọ dịghị etetakwa ọzọ; tutu ruo mgbe eluigwe na-agaghị adịkwa; mmadụ ọbụla apụghị i si nʼụra kpọtee ya, agaghị akpọtekwa ha site nʼụra ha.

Job 14:12 in English

Job 14:12 · Berean Standard Bible

so a man lies down and does not rise. Until the heavens are no more, he will not be awakened or roused from sleep.

Context

10Ma mmadụ na-anwụ, e lie ya; ọ na-ekubikwa ume si otu a gabiga. 11Dịka mmiri dị nʼoke osimiri si ata, maọbụ ka mmiri dị nʼiyi si ata nʼoge ọkọchị, 12otu a ka mmadụ si e dinaa ma ọ dịghị etetakwa ọzọ; tutu ruo mgbe eluigwe na-agaghị adịkwa; mmadụ ọbụla apụghị i si nʼụra kpọtee ya, agaghị akpọtekwa ha site nʼụra ha. 13“A sị na ị ga-ezo m nʼala mmụọ, na ị ga-ezobe m tutu ruo mgbe iwe gị gabigara. A sị na ị ga-akanyere m oge ma mesịa cheta m. 14Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ? Ụbọchị niile nke ọrụ ahụhụ m, aga m echere mgbe nnapụta m ga-abịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.