Jọn 9:14
John 9:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụ nʼụbọchị izuike ka Jisọs gwakọtara aja, jiri ya meghe anya ya.
John 9:14 in English
John 9:14 · Berean Standard Bible
Now the day on which Jesus had made the mud and opened his eyes was a Sabbath.
Context
12Ha sịrị ya, “Olee ebe nwoke ahụ nọ?”
Ọ sịrị, “Amaghị m.” 13Ha dutere nwoke ahụ kpuru ìsì na mbụ nʼihu ndị Farisii. 14Ma ọ bụ nʼụbọchị izuike ka Jisọs gwakọtara aja, jiri ya meghe anya ya. 15Ya mere, ndị Farisii jụrụ ya otu o si bido ịhụ ụzọ. Ọ sịrị ha, “Ọ gwakọtara aja tee m nʼanya, a sakwara m ihu ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.” 16Ụfọdụ ndị Farisii sịrị, “Nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ bịa, nʼihi na ọ dịghị edebe ụbọchị izuike.”
Ma ndị ọzọ na-asị, “Olee otu onye mmehie ga-esi rụọ ọrụ ịrịbama ndị dị otu a?” Nkewa dịrị nʼetiti ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.