Jọn 9:13
John 9:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha dutere nwoke ahụ kpuru ìsì na mbụ nʼihu ndị Farisii.
John 9:13 in English
John 9:13 · Berean Standard Bible
They brought to the Pharisees the man who had been blind.
Context
11Ọ zara, “Nwoke a na-akpọ Jisọs gwakọtara ụrọ tee m nʼanya. Ọ gwara m sị, ‘Gaa saa ihu gị nʼọdọ mmiri Sailọm.’ A gara m saa onwe m, malitekwa ịhụ ụzọ.” 12Ha sịrị ya, “Olee ebe nwoke ahụ nọ?”
Ọ sịrị, “Amaghị m.” 13Ha dutere nwoke ahụ kpuru ìsì na mbụ nʼihu ndị Farisii. 14Ma ọ bụ nʼụbọchị izuike ka Jisọs gwakọtara aja, jiri ya meghe anya ya. 15Ya mere, ndị Farisii jụrụ ya otu o si bido ịhụ ụzọ. Ọ sịrị ha, “Ọ gwakọtara aja tee m nʼanya, a sakwara m ihu ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.