Native Bible

John 4:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

(Ndị na-eso ụzọ ya abaala nʼime obodo ịga zụta nri.)

John 4:8 in English

John 4:8 · Berean Standard Bible

(His disciples had gone into the town to buy food.)

Context

6Olulu mmiri Jekọb dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na ike gwụrụ Jisọs nʼije ya, ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ olulu mmiri ahụ. Ọ bụ ihe dị ka oge ehihie. 7Otu nwanyị onye Sameria* bịara ịdọrọ mmiri, Jisọs sịrị ya, “Nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.” 8(Ndị na-eso ụzọ ya abaala nʼime obodo ịga zụta nri.) 9Nwanyị ahụ sịrị ya, “Olee otu gị bụ onye Juu si arịọ m bụ nwanyị Sameria mmiri ka ị ṅụọ?” (Nʼihi na ndị Juu na ndị Sameria anaghị emekọrịta ihe ọbụla.) 10Jisọs zara sị, “Ọ bụrụ na ị matara onyinye Chineke, na onye ahụ na-arịọ gị mmiri, ị gaara arịọ ya, ọ gakwara enye gị mmiri nke ndụ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.