Native Bible

John 4:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ọ batara nʼotu obodo nta dị na Sameria a na-akpọ Saika, nʼakụkụ ala ahụ Jekọb nyere Josef nwa ya nwoke.

John 4:5 in English

John 4:5 · Berean Standard Bible

So He came to a town of Samaria called Sychar, near the plot of ground that Jacob had given to his son Joseph.

Context

3Ọ hapụrụ Judịa laghachi azụ na Galili. 4Ma ọ ga-esite nʼetiti Sameria gafee. 5Ya mere, ọ batara nʼotu obodo nta dị na Sameria a na-akpọ Saika, nʼakụkụ ala ahụ Jekọb nyere Josef nwa ya nwoke. 6Olulu mmiri Jekọb dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na ike gwụrụ Jisọs nʼije ya, ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ olulu mmiri ahụ. Ọ bụ ihe dị ka oge ehihie. 7Otu nwanyị onye Sameria* bịara ịdọrọ mmiri, Jisọs sịrị ya, “Nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.