Jọn 19:16
John 19:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, o nyefere ya nʼaka ha, ka ha kpọgide ya nʼobe.
John 19:16 in English
John 19:16 · Berean Standard Bible
Then Pilate handed Jesus over to be crucified, and the soldiers took Him away.
Context
14Ọ bụ nʼihe dịka nʼoge ehihie nke ụbọchị nkwadebe maka oriri Ngabiga.
Ọ sịrị ndị Juu, “Leenụ eze unu!” 15Ma ha tiri mkpu, “Kpọpụ ya, Kpọpụ ya! Kpọgide ya nʼobe.”
Pailet jụrụ ha, “Unu chọrọ ka m kpọgide eze unu nʼobe?”
Ma ndịisi nchụaja zara, “Anyị enweghị eze ọzọ karịa Siza.” 16Mgbe ahụ, o nyefere ya nʼaka ha, ka ha kpọgide ya nʼobe. 17(16) Ha kpọọrọ Jisọs pụọ. (17) O buuru obe ya gaa nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi (nke pụtara Gọlgọta nʼasụsụ Hibru). 18Nʼebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe, ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ. Otu onye nʼaka nri ya, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.