Jọn 19:18
John 19:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe, ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ. Otu onye nʼaka nri ya, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya.
John 19:18 in English
John 19:18 · Berean Standard Bible
There they crucified Him, and with Him two others, one on each side, with Jesus in the middle.
Context
16Mgbe ahụ, o nyefere ya nʼaka ha, ka ha kpọgide ya nʼobe. 17(16) Ha kpọọrọ Jisọs pụọ. (17) O buuru obe ya gaa nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi (nke pụtara Gọlgọta nʼasụsụ Hibru). 18Nʼebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe, ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ. Otu onye nʼaka nri ya, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 19O nwere ihe Pailet dere kụpanye nʼelu obe ahụ. Ihe o dere bụ nke a:
Jisọs onye Nazaret, Eze ndị Juu. 20Ọtụtụ ndị Juu gụrụ ihe a o dere, nʼihi na ebe a kpọgburu Jisọs dị nso nʼobodo ahụ. E dekwara ya nʼasụsụ Hibru, Griik na Latin.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.