Jọn 19:14
John 19:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ nʼihe dịka nʼoge ehihie nke ụbọchị nkwadebe maka oriri Ngabiga. Ọ sịrị ndị Juu, “Leenụ eze unu!”
John 19:14 in English
John 19:14 · Berean Standard Bible
It was the day of Preparation for the Passover, about the sixth hour.* And Pilate said to the Jews, “Here is your King!”
Context
12Site na mgbe ahụ Pailet chọsịrị ike ịhapụ ya. Ma ndị Juu tisiri mkpu ike sị, “Ị hapụ nwoke a ka ọ laa, ị bụkwaghị enyi Siza. Nʼihi na onye ọbụla na-eme onwe ya eze na-elelị Siza.” 13Mgbe Pailet nụrụ okwu ndị a, ọ kpọpụtara Jisọs nʼezi, nọdụkwa ala nʼoche ikpe ya dị nʼebe a na-akpọ Pevumentị (maọbụ Gabata nʼasụsụ Hibru). 14Ọ bụ nʼihe dịka nʼoge ehihie nke ụbọchị nkwadebe maka oriri Ngabiga.
Ọ sịrị ndị Juu, “Leenụ eze unu!” 15Ma ha tiri mkpu, “Kpọpụ ya, Kpọpụ ya! Kpọgide ya nʼobe.”
Pailet jụrụ ha, “Unu chọrọ ka m kpọgide eze unu nʼobe?”
Ma ndịisi nchụaja zara, “Anyị enweghị eze ọzọ karịa Siza.” 16Mgbe ahụ, o nyefere ya nʼaka ha, ka ha kpọgide ya nʼobe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.