Jọn 14:16
John 14:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m arịọ Nna m, ọ ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ,* onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi.
John 14:16 in English
John 14:16 · Berean Standard Bible
And I will ask the Father, and He will give you another Advocate * to be with you forever—
Context
14Ihe ọbụla unu rịọrọ nʼaha m, aga m eme ya. 15“Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya unu ga-edebe iwu m niile. 16Aga m arịọ Nna m, ọ ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ,* onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi. 17Onye bụ Mmụọ nke eziokwu. Ndị bi nʼụwa agaghị anabata ya, nʼihi na ha adịghị ahụ ya anya, ha amakwaghị ya. Ma unu maara ya nʼihi na unu na ya nọ, o bikwa nʼime unu. 18Agaghị m ahapụ unu dị ka ndị na-enweghị nne na nna. Aga m abịakwute unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.