Jọn 14:17
John 14:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye bụ Mmụọ nke eziokwu. Ndị bi nʼụwa agaghị anabata ya, nʼihi na ha adịghị ahụ ya anya, ha amakwaghị ya. Ma unu maara ya nʼihi na unu na ya nọ, o bikwa nʼime unu.
John 14:17 in English
John 14:17 · Berean Standard Bible
the Spirit of truth. The world cannot receive Him, because it neither sees Him nor knows Him. But you do know Him, for He abides with you and will be in you.*
Context
15“Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya unu ga-edebe iwu m niile. 16Aga m arịọ Nna m, ọ ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ,* onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi. 17Onye bụ Mmụọ nke eziokwu. Ndị bi nʼụwa agaghị anabata ya, nʼihi na ha adịghị ahụ ya anya, ha amakwaghị ya. Ma unu maara ya nʼihi na unu na ya nọ, o bikwa nʼime unu. 18Agaghị m ahapụ unu dị ka ndị na-enweghị nne na nna. Aga m abịakwute unu. 19Mgbe na-adịghị anya, ụwa agaghị ahụkwa m anya. Ma unu ga-ahụ m anya. Nʼihi na m dị ndụ, unu ga-adịkwa ndụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.