Jọn 12:11
John 12:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka ọtụtụ ndị Juu ji na-ahapụ ha ma na-ekwerekwa na Jisọs.
John 12:11 in English
John 12:11 · Berean Standard Bible
for on account of him many of the Jews were deserting them and believing in Jesus.
Context
9Ma mgbe igwe ndị Juu nụrụ na ọ nọ nʼebe ahụ, ha bịara, ọ bụghị naanị ka ha hụ ya, kama ka ha hụkwa Lazarọs onye o mere ka o si na ndị nwuru anwụ bilie. 10Ya mere, ndịisi nchụaja gbakwara izu igbukwa Lazarọs. 11Nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka ọtụtụ ndị Juu ji na-ahapụ ha ma na-ekwerekwa na Jisọs. 12Nʼechi ya oke igwe mmadụ ahụ ndị bịara mmemme nụrụ na Jisọs na-abịa Jerusalem. 13Ha weere igu nkwụ pụọ izute ya na-eti mkpu,
“Hozanna!”
“Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!”*
“Ngọzị dịrị eze Izrel!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.