Jọn 12:13
John 12:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha weere igu nkwụ pụọ izute ya na-eti mkpu, “Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!”* “Ngọzị dịrị eze Izrel!”
John 12:13 in English
John 12:13 · Berean Standard Bible
They took palm branches and went out to meet Him, shouting: “Hosanna!”* “Blessed is He who comes in the name of the Lord!”* “Blessed is the King of Israel!”
Context
11Nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka ọtụtụ ndị Juu ji na-ahapụ ha ma na-ekwerekwa na Jisọs. 12Nʼechi ya oke igwe mmadụ ahụ ndị bịara mmemme nụrụ na Jisọs na-abịa Jerusalem. 13Ha weere igu nkwụ pụọ izute ya na-eti mkpu,
“Hozanna!”
“Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!”*
“Ngọzị dịrị eze Izrel!” 14Jisọs hụrụ nwa ịnyịnya ibu, nọkwasị nʼelu ya, dị ka e dere ya, 15“Atụla egwu, gị ada Zayọn!
Lee, eze gị ka ọ na-abịa.
Ọ nọkwasịrị nʼelu nwa ịnyịnya ibu.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.