Jọn 12:15
John 12:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Atụla egwu, gị ada Zayọn! Lee, eze gị ka ọ na-abịa. Ọ nọkwasịrị nʼelu nwa ịnyịnya ibu.”*
John 12:15 in English
John 12:15 · Berean Standard Bible
“Do not be afraid, O Daughter of Zion. See, your King is coming, seated on the colt of a donkey.”*
Context
13Ha weere igu nkwụ pụọ izute ya na-eti mkpu,
“Hozanna!”
“Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!”*
“Ngọzị dịrị eze Izrel!” 14Jisọs hụrụ nwa ịnyịnya ibu, nọkwasị nʼelu ya, dị ka e dere ya, 15“Atụla egwu, gị ada Zayọn!
Lee, eze gị ka ọ na-abịa.
Ọ nọkwasịrị nʼelu nwa ịnyịnya ibu.”* 16Na mbụ ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe ndị a niile. Ma mgbe e nyesịrị Jisọs otuto, ka ha chetara na-edererị ihe ndị a banyere ya, na e mekwara ya rịị ihe ndị a. 17Igwe mmadụ ahụ bụ ndị ya na ha nọ mgbe o si nʼili kpọpụta Lazarọs, mee ka o sị nʼọnwụ bilie, gara nʼihu na-agba ama ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.