Jeremaya 8:13
Jeremiah 8:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Aga m anapụ ha ihe owuwe ubi niile ha nwetara, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. Ha agaghị enwekwa mkpụrụ vaịnị, maọbụ mkpụrụ osisi fiig nʼelu osisi fiig ha. Akwụkwọ osisi ndị a niile ga-akpọnwụ. A ga-anapụkwa ha ihe niile m nyere ha.’ ”
Jeremiah 8:13 in English
Jeremiah 8:13 · Berean Standard Bible
I will take away their harvest, declares the LORD. There will be no grapes on the vine, nor figs on the tree, and even the leaf will wither. Whatever I have given them will be lost to them.”
Context
11Ha na-ekechi ọnya ndị m
dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ.
Ha na-asị, “Udo dị, udo dị,”
mgbe udo na-adịghị. 12Ihere o mere ha nʼihi omume arụ ha niile?
Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị;
nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere.
Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada;
ha ga-asọ ngọngọ mgbe e nyere ha ntaramahụhụ.
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 13“ ‘Aga m anapụ ha ihe owuwe ubi niile ha nwetara,
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Ha agaghị enwekwa mkpụrụ vaịnị,
maọbụ mkpụrụ osisi fiig nʼelu osisi fiig ha.
Akwụkwọ osisi ndị a niile ga-akpọnwụ.
A ga-anapụkwa ha
ihe niile m nyere ha.’ ” 14Gịnị ka unu na-eme nʼebe a unu nọdụrụ ala?
Kwakọtaanụ ihe unu niile.
Ngwa, ka anyị gbapụnụ ọsọ gaa nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike
nọdụ nʼebe ahụ nwụọ!
Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke anyị amaala anyị ikpe ọnwụ.
O nyela anyị mmiri e tinyere nsi ka anyị ṅụọ,
nʼihi na anyị emehiela megide ya. 15Anyị lere anya udo,
ma o nweghị ihe ọma ọbụla anyị hụrụ.
Anyị lere anya ọgwụgwọ ọrịa anyị,
maọbụ naanị ihe egwu ka anyị hụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.