Native Bible

Jeremiah 8:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihere o mere ha nʼihi omume arụ ha niile? Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị; nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere. Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada; ha ga-asọ ngọngọ mgbe e nyere ha ntaramahụhụ. Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.

Jeremiah 8:12 in English

Jeremiah 8:12 · Berean Standard Bible

Are they ashamed of the abomination they have committed? No, they have no shame at all; they do not even know how to blush. So they will fall among the fallen; when I punish them, they will collapse, says the LORD.

Context

10Ya mere, aga m akpọnye ndị ikom ọzọ nwunye ha, werekwa ubi ha nyefee nʼaka ndị ọrụ ubi ọzọ. Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta, ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha. Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ. 11Ha na-ekechi ọnya ndị m dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ. Ha na-asị, “Udo dị, udo dị,” mgbe udo na-adịghị. 12Ihere o mere ha nʼihi omume arụ ha niile? Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị; nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere. Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada; ha ga-asọ ngọngọ mgbe e nyere ha ntaramahụhụ. Otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 13“ ‘Aga m anapụ ha ihe owuwe ubi niile ha nwetara, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. Ha agaghị enwekwa mkpụrụ vaịnị, maọbụ mkpụrụ osisi fiig nʼelu osisi fiig ha. Akwụkwọ osisi ndị a niile ga-akpọnwụ. A ga-anapụkwa ha ihe niile m nyere ha.’ ” 14Gịnị ka unu na-eme nʼebe a unu nọdụrụ ala? Kwakọtaanụ ihe unu niile. Ngwa, ka anyị gbapụnụ ọsọ gaa nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike nọdụ nʼebe ahụ nwụọ! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke anyị amaala anyị ikpe ọnwụ. O nyela anyị mmiri e tinyere nsi ka anyị ṅụọ, nʼihi na anyị emehiela megide ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.