Jeremaya 5:30
Jeremiah 5:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ihe ọjọọ nke jọbigara njọ oke emeela nʼala a.
Jeremiah 5:30 in English
Jeremiah 5:30 · Berean Standard Bible
A horrible and shocking thing has happened in the land.
Context
28ha amaala abụba, anụ ahụ ha na-akwọkwa mụrụmụrụ.
Ajọ ọrụ ha enweghị nsọtụ;
ha adịghị achọkwa ikpe ziri ezi.
Ha adịghị ekwuchite ọnụ onye na-enweghị nna;
ha adịghị ekwuchitekwa ọnụ ndị ogbenye ime ka ha nweta ihe ruuru ha. 29M ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?”
ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ.
“M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ
megide mba dị otu a? 30“Ihe ọjọọ nke jọbigara njọ oke
emeela nʼala a. 31Lee, ndị amụma na-ebu naanị amụma ụgha,
ndị nchụaja na-achịkwa ndị m site nʼọchịchị nke nʼaka ike,
ma lee, ndị m hụrụ ndụ dị otu a nʼanya.
Gịnịkwa ka unu ga-eme nʼoge ikpeazụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.