Jeremaya 5:28
Jeremiah 5:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ha amaala abụba, anụ ahụ ha na-akwọkwa mụrụmụrụ. Ajọ ọrụ ha enweghị nsọtụ; ha adịghị achọkwa ikpe ziri ezi. Ha adịghị ekwuchite ọnụ onye na-enweghị nna; ha adịghị ekwuchitekwa ọnụ ndị ogbenye ime ka ha nweta ihe ruuru ha.
Jeremiah 5:28 in English
Jeremiah 5:28 · Berean Standard Bible
They have grown fat and sleek, and have excelled in the deeds of the wicked. They have not taken up the cause of the fatherless, that they might prosper; nor have they defended the rights of the needy.
Context
26“E nwere ndị ajọ mmadụ nʼetiti ndị m,
ndị na-edo onwe ha dịka ndị mmadụ na-esiri nnụnụ ọnya,
dịka ndị na-esi ọnya ka ha nwude mmadụ. 27Dịka nkata a kpara nke nnụnụ jupụtara nʼime ya,
ụlọ ndị dị otu a jupụtara nʼaghụghọ.
Nʼihi nke a, ha ghọrọ ndị ọgaranya na ndị dị ike, 28ha amaala abụba, anụ ahụ ha na-akwọkwa mụrụmụrụ.
Ajọ ọrụ ha enweghị nsọtụ;
ha adịghị achọkwa ikpe ziri ezi.
Ha adịghị ekwuchite ọnụ onye na-enweghị nna;
ha adịghị ekwuchitekwa ọnụ ndị ogbenye ime ka ha nweta ihe ruuru ha. 29M ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?”
ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ.
“M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ
megide mba dị otu a? 30“Ihe ọjọọ nke jọbigara njọ oke
emeela nʼala a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.