Native Bible

Jeremiah 5:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ihe ndị a niile, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Nʼihi na okwu ndị a esitela nʼọnụ ndị a pụta, aga m eme ka okwu m, nke si gị nʼọnụ na-apụta, ghọọ ọkụ. Aga m emekwa ka ndị a ghọọ nkụ ọkụ ahụ ga-erepịa.

Jeremiah 5:14 in English

Jeremiah 5:14 · Berean Standard Bible

Therefore this is what the LORD God of Hosts says: “Because you have spoken this word, I will make My words a fire in your mouth and this people the wood it consumes.

Context

12Ha ekwuola okwu ụgha megide Onyenwe anyị. E, ha ekwuola sị, “O nweghị ihe Ọ ga-eme! Ihe ọjọọ ọbụla agaghị adakwasị anyị; mbibi nke ụnwụ na mma agha na-eweta agaghị erute anyị nso. 13Ndị amụma ndị a niile dịka ikuku, nke okwu nwere isi na-adịghị nʼime ha. Ya mere, ka ihe ahụ niile ha buru nʼamụma bịakwasị ha.” 14Nʼihi ihe ndị a niile, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Nʼihi na okwu ndị a esitela nʼọnụ ndị a pụta, aga m eme ka okwu m, nke si gị nʼọnụ na-apụta, ghọọ ọkụ. Aga m emekwa ka ndị a ghọọ nkụ ọkụ ahụ ga-erepịa. 15Unu bụ ndị Izrel,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka otu mba si nʼebe dị anya bịa megide unu. Ọ bụ mba na-adị site na mgbe ochie, mba dị ike, nke unu na-adịghị anụ asụsụ ha, ndị unu na-adịghị aghọta okwu ha. 16Akpa àkụ ha dịka ili ghere oghe; ha niile bụkwa ndị dike nʼagha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.