Jeremaya 5:15
Jeremiah 5:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu bụ ndị Izrel,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka otu mba si nʼebe dị anya bịa megide unu. Ọ bụ mba na-adị site na mgbe ochie, mba dị ike, nke unu na-adịghị anụ asụsụ ha, ndị unu na-adịghị aghọta okwu ha.
Jeremiah 5:15 in English
Jeremiah 5:15 · Berean Standard Bible
Behold, I am bringing a distant nation against you, O house of Israel,” declares the LORD. “It is an established nation, an ancient nation, a nation whose language you do not know and whose speech you do not understand.
Context
13Ndị amụma ndị a niile dịka ikuku,
nke okwu nwere isi na-adịghị nʼime ha.
Ya mere, ka ihe ahụ niile ha buru nʼamụma bịakwasị ha.” 14Nʼihi ihe ndị a niile, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Nʼihi na okwu ndị a esitela nʼọnụ ndị a pụta,
aga m eme ka okwu m, nke si gị nʼọnụ na-apụta, ghọọ ọkụ.
Aga m emekwa ka ndị a ghọọ nkụ ọkụ ahụ ga-erepịa. 15Unu bụ ndị Izrel,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“Aga m eme ka otu mba si nʼebe dị anya bịa megide unu.
Ọ bụ mba na-adị site na mgbe ochie, mba dị ike,
nke unu na-adịghị anụ asụsụ ha,
ndị unu na-adịghị aghọta okwu ha. 16Akpa àkụ ha dịka ili ghere oghe;
ha niile bụkwa ndị dike nʼagha. 17Ha ga-eripịa ihe niile unu wetara nʼubi, ya na nri niile unu nwere.
Ha ga-ebibi ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị.
Ha ga-ebibi igwe ewu na atụrụ unu, na igwe ehi unu.
Ha ga-ebibikwa osisi vaịnị na osisi fiig unu.
Ọ bụ mma agha ha ka ha ga-eji bibie obodo unu niile e wusiri ike,
bụ obodo ndị ahụ niile unu na-atụkwasị uche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.