Native Bible

Jeremiah 46:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m, nʼihi na anọnyeere m gị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “A sịkwarị na m ebibie mba ndị ahụ niile nke m mere ka ị gaa biri nʼetiti ha kpamkpam, agaghị m ebibi gị kpamkpam. Aga m adọ gị aka na ntị, ma ọ ga-abụ site nʼụzọ ikpe ikpe ziri ezi. Agakwaghị m ahapụ inye gị ahụhụ i kwesiri ịnata.” 46:7 Maọbụ, na-eruju 46:20 Odudo na ijiji bụ ihe na-ata anụmanụ

Jeremiah 46:28 in English

Jeremiah 46:28 · Berean Standard Bible

And you, My servant Jacob, do not be afraid, declares the LORD, for I am with you. Though I will completely destroy all the nations to which I have banished you, I will not completely destroy you. Yet I will discipline you justly, and will by no means leave you unpunished.”

Context

26Aga m enyefe ha nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike, bụ Nebukadneza eze Babilọn, na ndịisi ọchịchị ya. Ma nʼikpeazụ, aga m emekwa ka ndị mmadụ birikwa nʼime ya ọzọ, dịka e si biri nʼime ya na mgbe ochie.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 27“Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m. Adakwala mba, gị Izrel. Nʼihi na lee, aghaghị m ịzọpụta gị site nʼebe dị anya nke e mere ka ị gaa biri. Aga m azọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site nʼala ebe e mere ka ha gbapụ ọsọ gaa biri. Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo, na-atụghị egwu ọbụla. Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ọ tụọ ụjọ. 28Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m, nʼihi na anọnyeere m gị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “A sịkwarị na m ebibie mba ndị ahụ niile nke m mere ka ị gaa biri nʼetiti ha kpamkpam, agaghị m ebibi gị kpamkpam. Aga m adọ gị aka na ntị, ma ọ ga-abụ site nʼụzọ ikpe ikpe ziri ezi. Agakwaghị m ahapụ inye gị ahụhụ i kwesiri ịnata.” 46:7 Maọbụ, na-eruju 46:20 Odudo na ijiji bụ ihe na-ata anụmanụ

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.