Native Bible

Jeremiah 42:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m enwe obi ebere nʼebe unu nọ, si otu a mee ka ya onwe ya nweekwa obi ebere nʼebe unu nọ. Ọ ga-emekwa ka unu nwetaghachikwa ala unu.’

Jeremiah 42:12 in English

Jeremiah 42:12 · Berean Standard Bible

And I will show you compassion, and he will have compassion on you and restore you to your own land.’

Context

10‘Ọ bụrụ na unu anọgide nʼala a, aga m ewuli unu elu; agaghị m akwada unu. Aga m akụkwa unu dịka osisi, gharakwa ihopu unu. Nʼihi na ihe ọjọọ ahụ m mere ka ọ bịakwasị unu na-ewute m nke ukwuu. 11Unu atụla eze Babilọn egwu, bụ onye unu na-atụ egwu ya ugbu a. Unu atụla ya egwu, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, nʼihi na anọnyeere m unu, aga m azọpụta unu, napụtakwa unu site nʼaka ya. 12Aga m enwe obi ebere nʼebe unu nọ, si otu a mee ka ya onwe ya nweekwa obi ebere nʼebe unu nọ. Ọ ga-emekwa ka unu nwetaghachikwa ala unu.’ 13“Ma ọ bụrụ na unu onwe unu asị, ‘Anyị agaghị anọgide nʼala a,’ si otu a nupu isi nʼebe Onyenwe anyị Chineke unu nọ; 14ọ bụrụkwa na unu asị, ‘Mba, anyị ga-aga biri nʼala Ijipt ebe anyị na-agaghị ahụ agha, maọbụ nụ ụda opi ike, maọbụ nọọ agụụ nʼihi enweghị ihe oriri,’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.