Jeremaya 42:11
Jeremiah 42:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu atụla eze Babilọn egwu, bụ onye unu na-atụ egwu ya ugbu a. Unu atụla ya egwu, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, nʼihi na anọnyeere m unu, aga m azọpụta unu, napụtakwa unu site nʼaka ya.
Jeremiah 42:11 in English
Jeremiah 42:11 · Berean Standard Bible
Do not be afraid of the king of Babylon, whom you now fear; do not be afraid of him, declares the LORD, for I am with you to save you and deliver you from him.
Context
9Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu sị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, onye unu zigara m ka m wegara arịrịọ unu, sịrị: 10‘Ọ bụrụ na unu anọgide nʼala a, aga m ewuli unu elu; agaghị m akwada unu. Aga m akụkwa unu dịka osisi, gharakwa ihopu unu. Nʼihi na ihe ọjọọ ahụ m mere ka ọ bịakwasị unu na-ewute m nke ukwuu. 11Unu atụla eze Babilọn egwu, bụ onye unu na-atụ egwu ya ugbu a. Unu atụla ya egwu, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, nʼihi na anọnyeere m unu, aga m azọpụta unu, napụtakwa unu site nʼaka ya. 12Aga m enwe obi ebere nʼebe unu nọ, si otu a mee ka ya onwe ya nweekwa obi ebere nʼebe unu nọ. Ọ ga-emekwa ka unu nwetaghachikwa ala unu.’ 13“Ma ọ bụrụ na unu onwe unu asị, ‘Anyị agaghị anọgide nʼala a,’ si otu a nupu isi nʼebe Onyenwe anyị Chineke unu nọ;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.