Native Bible

Jeremiah 41:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ishmel gbukwara ndị ikom Juda niile ha na Gedaliya nọ na Mizpa, gbukwaa ndị agha Babilọn nọkwa nʼebe ahụ.

Jeremiah 41:3 in English

Jeremiah 41:3 · Berean Standard Bible

Ishmael also killed all the Jews who were with Gedaliah at Mizpah, as well as the Chaldean * soldiers who were there.

Context

1Nʼọnwa nke asaa, Ishmel nwa Netanaya, nwa Elishama, onye si nʼagbụrụ eze, na onye naara abụ otu nʼime ndịisi ozi eze, duuru ndị ikom iri bịa nʼụlọ Gedaliya nwa Ahikam na Mizpa. Mgbe Gedaliya soo ha niile na-eri nri, 2Ishmel nwa Netanaya na mmadụ iri ndị ahụ ya na ha so, biliri jiri mma agha tigbuo Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, bụ onye eze Babilọn họpụtara dịka onye na-achị ala ahụ niile. 3Ishmel gbukwara ndị ikom Juda niile ha na Gedaliya nọ na Mizpa, gbukwaa ndị agha Babilọn nọkwa nʼebe ahụ. 4Nʼụbọchị na-eso ụbọchị ahụ ha gbusịrị Gedaliya, tupu mmadụ ọbụla anụ ihe banyere ya, 5o nwere iri mmadụ asatọ, bụ ndị kpụchara afụọnụ ha, dọwasịa uwe ha, gbukasịakwa onwe ha ahụ, sitere nʼobodo Shekem, na Shaịlo na Sameria buuru onyinye ịnata ihuọma, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-abịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.