Native Bible

Jeremiah 41:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼọnwa nke asaa, Ishmel nwa Netanaya, nwa Elishama, onye si nʼagbụrụ eze, na onye naara abụ otu nʼime ndịisi ozi eze, duuru ndị ikom iri bịa nʼụlọ Gedaliya nwa Ahikam na Mizpa. Mgbe Gedaliya soo ha niile na-eri nri,

Jeremiah 41:1 in English

Jeremiah 41:1 · Berean Standard Bible

In the seventh month, Ishmael son of Nethaniah, the son of Elishama, who was a member of the royal family and one of the king’s chief officers, came with ten men to Gedaliah son of Ahikam at Mizpah, and they ate a meal together there.

Context

1Nʼọnwa nke asaa, Ishmel nwa Netanaya, nwa Elishama, onye si nʼagbụrụ eze, na onye naara abụ otu nʼime ndịisi ozi eze, duuru ndị ikom iri bịa nʼụlọ Gedaliya nwa Ahikam na Mizpa. Mgbe Gedaliya soo ha niile na-eri nri, 2Ishmel nwa Netanaya na mmadụ iri ndị ahụ ya na ha so, biliri jiri mma agha tigbuo Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, bụ onye eze Babilọn họpụtara dịka onye na-achị ala ahụ niile. 3Ishmel gbukwara ndị ikom Juda niile ha na Gedaliya nọ na Mizpa, gbukwaa ndị agha Babilọn nọkwa nʼebe ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.