Native Bible

Jeremiah 41:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

o nwere iri mmadụ asatọ, bụ ndị kpụchara afụọnụ ha, dọwasịa uwe ha, gbukasịakwa onwe ha ahụ, sitere nʼobodo Shekem, na Shaịlo na Sameria buuru onyinye ịnata ihuọma, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-abịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.

Jeremiah 41:5 in English

Jeremiah 41:5 · Berean Standard Bible

eighty men who had shaved off their beards, torn their garments, and cut themselves came from Shechem, Shiloh, and Samaria, carrying grain offerings and frankincense for the house of the LORD.

Context

3Ishmel gbukwara ndị ikom Juda niile ha na Gedaliya nọ na Mizpa, gbukwaa ndị agha Babilọn nọkwa nʼebe ahụ. 4Nʼụbọchị na-eso ụbọchị ahụ ha gbusịrị Gedaliya, tupu mmadụ ọbụla anụ ihe banyere ya, 5o nwere iri mmadụ asatọ, bụ ndị kpụchara afụọnụ ha, dọwasịa uwe ha, gbukasịakwa onwe ha ahụ, sitere nʼobodo Shekem, na Shaịlo na Sameria buuru onyinye ịnata ihuọma, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-abịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. 6Ishmel nwa Netanaya sitere na Mizpa pụọ izute ha, na-akwa akwa mgbe ọ na-aga. Mgbe o zutere ha, ọ sịrị ha, “Bịakwutenụ Gedaliya nwa Ahikam.” 7Mgbe ha batara nʼobodo, Ishmel nwa Netanaya na ndị ikom ahụ bụ ndị so ya, gburu ndị ahụ tụnye ozu ha nʼime olulu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.