Jeremaya 4:24
Jeremiah 4:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Elere m anya nʼugwu ukwu, hụ na ha na-ama jijiji, leekwa anya nʼugwu nta, hụ na ha na-aṅagharị aṅagharị.
Jeremiah 4:24 in English
Jeremiah 4:24 · Berean Standard Bible
I looked at the mountains, and behold, they were quaking; all the hills were swaying.
Context
22“Ndị m bụ ndị nzuzu,
ha amaghị m.
Ha bụ ụmụntakịrị ndị na-enweghị uche,
ha enweghị nghọta ọbụla.
Ha bụ ọkachamara nʼihe gbasara ajọ omume,
ma ha amaghị otu esi eme ezi ihe ọbụla.” 23Elere m anya nʼụwa
hụ na ọ bụ ihe tọgbọrọ nʼefu,
leekwa anya na mbara eluigwe,
ma o nweghị ìhè dị ya. 24Elere m anya nʼugwu ukwu,
hụ na ha na-ama jijiji,
leekwa anya nʼugwu nta, hụ na ha na-aṅagharị aṅagharị. 25Elere m anya ma ahụghị mmadụ ọbụla,
ụmụ nnụnụ niile dị na mbara eluigwe efefusịala. 26Ala ọma ahụ aghọọla ọzara,
obodo niile aghọọla mkputamkpu ebe
nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu oke iwe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.