Jeremaya 4:22
Jeremiah 4:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ndị m bụ ndị nzuzu, ha amaghị m. Ha bụ ụmụntakịrị ndị na-enweghị uche, ha enweghị nghọta ọbụla. Ha bụ ọkachamara nʼihe gbasara ajọ omume, ma ha amaghị otu esi eme ezi ihe ọbụla.”
Jeremiah 4:22 in English
Jeremiah 4:22 · Berean Standard Bible
“For My people are fools; they have not known Me. They are foolish children, without understanding. They are skilled in doing evil, but they know not how to do good.”
Context
20Mbibi na-arị mbibi ibe ya elu,
lee na a laala ala a niile nʼiyi.
Na mberede, e bibiela ụlọ ikwu anyị niile;
a dọkasịkwala akwa mgbochi ha niile. 21Ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-ahụ ọkọlọtọ agha ndị a a na-alụ?
Ruo ole mgbe kwa ka m ga-anọgide na-anụ ụda opi ike? 22“Ndị m bụ ndị nzuzu,
ha amaghị m.
Ha bụ ụmụntakịrị ndị na-enweghị uche,
ha enweghị nghọta ọbụla.
Ha bụ ọkachamara nʼihe gbasara ajọ omume,
ma ha amaghị otu esi eme ezi ihe ọbụla.” 23Elere m anya nʼụwa
hụ na ọ bụ ihe tọgbọrọ nʼefu,
leekwa anya na mbara eluigwe,
ma o nweghị ìhè dị ya. 24Elere m anya nʼugwu ukwu,
hụ na ha na-ama jijiji,
leekwa anya nʼugwu nta, hụ na ha na-aṅagharị aṅagharị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.