Jeremaya 4:21
Jeremiah 4:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-ahụ ọkọlọtọ agha ndị a a na-alụ? Ruo ole mgbe kwa ka m ga-anọgide na-anụ ụda opi ike?
Jeremiah 4:21 in English
Jeremiah 4:21 · Berean Standard Bible
How long must I see the signal flag and hear the sound of the horn?
Context
19Ihe mgbu a dị ukwuu.
Lee na apụghị m ịnagide ya.
Obi m o, obi m o!
Lee ka obi m si ada m gbim gbim gbim.
Apụghịkwa m ịnọ jụụ.
Ana m anụ ụda opi ike,
na-anụkwa ụzụ agha. 20Mbibi na-arị mbibi ibe ya elu,
lee na a laala ala a niile nʼiyi.
Na mberede, e bibiela ụlọ ikwu anyị niile;
a dọkasịkwala akwa mgbochi ha niile. 21Ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-ahụ ọkọlọtọ agha ndị a a na-alụ?
Ruo ole mgbe kwa ka m ga-anọgide na-anụ ụda opi ike? 22“Ndị m bụ ndị nzuzu,
ha amaghị m.
Ha bụ ụmụntakịrị ndị na-enweghị uche,
ha enweghị nghọta ọbụla.
Ha bụ ọkachamara nʼihe gbasara ajọ omume,
ma ha amaghị otu esi eme ezi ihe ọbụla.” 23Elere m anya nʼụwa
hụ na ọ bụ ihe tọgbọrọ nʼefu,
leekwa anya na mbara eluigwe,
ma o nweghị ìhè dị ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.