Native Bible

Jeremiah 38:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe ndị a kwa ka Onyenwe anyị kwuru, ‘A ga-arara obodo a nyefee ya nʼaka ndị agha eze Babilọn, onye ga-adọta ya nʼagha.’ ”

Jeremiah 38:3 in English

Jeremiah 38:3 · Berean Standard Bible

This is what the LORD says: This city will surely be delivered into the hands of the army of the king of Babylon, and he will capture it.”

Context

1Shefataya nwa Matan, na Gedaliya nwa Pashua, na Jehukal* nwa Shelemaya, na Pashua, nwa Malkija, nụrụ mgbe Jeremaya nọ na-agwa ndị mmadụ okwu ndị a sị ha, 2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Onye ọbụla nọgidere nʼime obodo a ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼụnwụ, maọbụ site nʼọrịa na-efe efe. Ma onye ọbụla pụkwuru ndị Babilọn ga-adị ndụ. Ọ ga-adị ndụ, nʼihi na ọ ga-echebe ndụ ya.’ 3Ihe ndị a kwa ka Onyenwe anyị kwuru, ‘A ga-arara obodo a nyefee ya nʼaka ndị agha eze Babilọn, onye ga-adọta ya nʼagha.’ ” 4Mgbe ahụ, ndịisi ọchịchị sịrị eze, “O kwesiri ka e gbuo nwoke a, nʼihi na ọ na-eme ka obi ndị agha na obi ndị mmadụ fọdụrụ nʼime obodo a na-ada mba site nʼụdị okwu ọ na-agwa ha. Ọ bụghị ọdịmma ndị a ka ọ na-eche echiche ya, kama ọ bụ otu ha ga-esi laa nʼiyi.” 5Zedekaya bụ eze zara sị ha, “Ọ dị unu nʼaka. Unu maara na o nweghị ihe ọbụla eze nwere ike ime igbochi unu ime ihe unu chọrọ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.