Jeremaya 38:1
Jeremiah 38:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Shefataya nwa Matan, na Gedaliya nwa Pashua, na Jehukal* nwa Shelemaya, na Pashua, nwa Malkija, nụrụ mgbe Jeremaya nọ na-agwa ndị mmadụ okwu ndị a sị ha,
Jeremiah 38:1 in English
Jeremiah 38:1 · Berean Standard Bible
Now Shephatiah son of Mattan, Gedaliah son of Pashhur, Jucal * son of Shelemiah, and Pashhur son of Malchijah heard that Jeremiah had been telling all the people:
Context
1Shefataya nwa Matan, na Gedaliya nwa Pashua, na Jehukal* nwa Shelemaya, na Pashua, nwa Malkija, nụrụ mgbe Jeremaya nọ na-agwa ndị mmadụ okwu ndị a sị ha, 2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Onye ọbụla nọgidere nʼime obodo a ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼụnwụ, maọbụ site nʼọrịa na-efe efe. Ma onye ọbụla pụkwuru ndị Babilọn ga-adị ndụ. Ọ ga-adị ndụ, nʼihi na ọ ga-echebe ndụ ya.’ 3Ihe ndị a kwa ka Onyenwe anyị kwuru, ‘A ga-arara obodo a nyefee ya nʼaka ndị agha eze Babilọn, onye ga-adọta ya nʼagha.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.