Jeremaya 38:5
Jeremiah 38:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Zedekaya bụ eze zara sị ha, “Ọ dị unu nʼaka. Unu maara na o nweghị ihe ọbụla eze nwere ike ime igbochi unu ime ihe unu chọrọ.”
Jeremiah 38:5 in English
Jeremiah 38:5 · Berean Standard Bible
“Here he is,” replied King Zedekiah. “He is in your hands, since the king can do nothing to stop you.”
Context
3Ihe ndị a kwa ka Onyenwe anyị kwuru, ‘A ga-arara obodo a nyefee ya nʼaka ndị agha eze Babilọn, onye ga-adọta ya nʼagha.’ ” 4Mgbe ahụ, ndịisi ọchịchị sịrị eze, “O kwesiri ka e gbuo nwoke a, nʼihi na ọ na-eme ka obi ndị agha na obi ndị mmadụ fọdụrụ nʼime obodo a na-ada mba site nʼụdị okwu ọ na-agwa ha. Ọ bụghị ọdịmma ndị a ka ọ na-eche echiche ya, kama ọ bụ otu ha ga-esi laa nʼiyi.” 5Zedekaya bụ eze zara sị ha, “Ọ dị unu nʼaka. Unu maara na o nweghị ihe ọbụla eze nwere ike ime igbochi unu ime ihe unu chọrọ.” 6Ya mere, ha jidere Jeremaya, tinye ya nʼime olulu mmiri Malkija, nwa eze. Olulu mmiri a dị nʼogige ụlọ ndị nche. Ọ bụ ụdọ ka ha ji wetuo Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ. Ma mmiri adịghị nʼime ya, naanị apịtị. Ya mere, Jeremaya danyere nʼime apịtị ahụ, mibanye nʼime ya. 7Ma Ebed-Melek, onye Kush, otu nʼime ndịisi ozi nʼụlọeze nụrụ na etinyela Jeremaya nʼime olulu mmiri. Mgbe eze nọdụrụ nʼọnụ ụzọ ama Benjamin,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.