Native Bible

Jeremiah 32:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m eme ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ha. Agaghị m akwụsị imere ha ihe ọma, aga m akwalikwa obi ha ịtụ egwu m. Nʼụzọ dị otu a, ha agaghị esitekwa nʼiso m wezuga onwe ha.

Jeremiah 32:40 in English

Jeremiah 32:40 · Berean Standard Bible

I will make an everlasting covenant with them: I will never turn away from doing good to them, and I will put My fear in their hearts, so that they will never turn away from Me.

Context

38Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. 39Aga m enye ha otu obi na otu ụzọ, ime ka ha na-atụ egwu m, nʼihi ọdịmma nke ha, na ọdịmma nke ụmụ ha ndị ga-eso ha. 40Aga m eme ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ha. Agaghị m akwụsị imere ha ihe ọma, aga m akwalikwa obi ha ịtụ egwu m. Nʼụzọ dị otu a, ha agaghị esitekwa nʼiso m wezuga onwe ha. 41Obi ga-atọkwa m ụtọ ime ha mma; m ga-ejikwa obi m niile, na mkpụrụobi m niile kụọ ha nʼala a. 42“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Dịka m mere ka ihe ọjọọ ukwuu a niile bịakwasị ndị a, otu a ka m ga-esikwa mee ka ezi ihe ahụ niile m kwere ha na nkwa bịakwasị ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.