Native Bible

Jeremiah 32:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.

Jeremiah 32:38 in English

Jeremiah 32:38 · Berean Standard Bible

They will be My people, and I will be their God.*

Context

36“Ihe i kwuru banyere obodo a bụ, ‘A ga-esite na mma agha, na nʼụnwụ, na nʼoke ọrịa, nyefee ha nʼaka eze Babilọn,’ ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, 37Lee, aghaghị m ịchịkọta ha site na mba ndị ahụ niile m sitere nʼiwe m, na nʼoke ọnụma m chụga ha. Aga m akpọghachite ha nʼebe a, mee ka ha biri nʼudo. 38Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. 39Aga m enye ha otu obi na otu ụzọ, ime ka ha na-atụ egwu m, nʼihi ọdịmma nke ha, na ọdịmma nke ụmụ ha ndị ga-eso ha. 40Aga m eme ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ha. Agaghị m akwụsị imere ha ihe ọma, aga m akwalikwa obi ha ịtụ egwu m. Nʼụzọ dị otu a, ha agaghị esitekwa nʼiso m wezuga onwe ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.