Jeremaya 32:37
Jeremiah 32:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee, aghaghị m ịchịkọta ha site na mba ndị ahụ niile m sitere nʼiwe m, na nʼoke ọnụma m chụga ha. Aga m akpọghachite ha nʼebe a, mee ka ha biri nʼudo.
Jeremiah 32:37 in English
Jeremiah 32:37 · Berean Standard Bible
I will surely gather My people from all the lands to which I have banished them in My furious anger and great wrath, and I will return them to this place and make them dwell in safety.
Context
35Ha wuru ebe dị elu dị iche iche na Ndagwurugwu nke Ben Hinom nye Baal, ebe ha nọ jiri ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom chụọ aja nye Molek. O nweghị mgbe m nyere ha iwu ime ihe dị otu a, o nweghị mgbe ajọ ihe dị otu a batara m nʼobi, nke i nye ha iwu ime ihe arụ dị otu a, nke ime ka Juda mehie. 36“Ihe i kwuru banyere obodo a bụ, ‘A ga-esite na mma agha, na nʼụnwụ, na nʼoke ọrịa, nyefee ha nʼaka eze Babilọn,’ ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, 37Lee, aghaghị m ịchịkọta ha site na mba ndị ahụ niile m sitere nʼiwe m, na nʼoke ọnụma m chụga ha. Aga m akpọghachite ha nʼebe a, mee ka ha biri nʼudo. 38Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. 39Aga m enye ha otu obi na otu ụzọ, ime ka ha na-atụ egwu m, nʼihi ọdịmma nke ha, na ọdịmma nke ụmụ ha ndị ga-eso ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.