Native Bible

Jeremiah 32:41 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Obi ga-atọkwa m ụtọ ime ha mma; m ga-ejikwa obi m niile, na mkpụrụobi m niile kụọ ha nʼala a.

Jeremiah 32:41 in English

Jeremiah 32:41 · Berean Standard Bible

Yes, I will rejoice in doing them good, and I will faithfully plant them in this land with all My heart and with all My soul.

Context

39Aga m enye ha otu obi na otu ụzọ, ime ka ha na-atụ egwu m, nʼihi ọdịmma nke ha, na ọdịmma nke ụmụ ha ndị ga-eso ha. 40Aga m eme ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ha. Agaghị m akwụsị imere ha ihe ọma, aga m akwalikwa obi ha ịtụ egwu m. Nʼụzọ dị otu a, ha agaghị esitekwa nʼiso m wezuga onwe ha. 41Obi ga-atọkwa m ụtọ ime ha mma; m ga-ejikwa obi m niile, na mkpụrụobi m niile kụọ ha nʼala a. 42“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Dịka m mere ka ihe ọjọọ ukwuu a niile bịakwasị ndị a, otu a ka m ga-esikwa mee ka ezi ihe ahụ niile m kwere ha na nkwa bịakwasị ha. 43A ga-azụkwa ọhịa* nʼala a unu na-asị na ọ bụ ala tọgbọrọ nʼefu, nke mmadụ na anụmanụ na-adịghị nʼime ya, ala nke e nyefere nʼaka ndị Babilọn.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.