Native Bible

Jeremiah 32:43 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A ga-azụkwa ọhịa* nʼala a unu na-asị na ọ bụ ala tọgbọrọ nʼefu, nke mmadụ na anụmanụ na-adịghị nʼime ya, ala nke e nyefere nʼaka ndị Babilọn.

Jeremiah 32:43 in English

Jeremiah 32:43 · Berean Standard Bible

And fields will be bought in this land about which you are saying, ‘It is a desolation, without man or beast; it has been delivered into the hands of the Chaldeans.’

Context

41Obi ga-atọkwa m ụtọ ime ha mma; m ga-ejikwa obi m niile, na mkpụrụobi m niile kụọ ha nʼala a. 42“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Dịka m mere ka ihe ọjọọ ukwuu a niile bịakwasị ndị a, otu a ka m ga-esikwa mee ka ezi ihe ahụ niile m kwere ha na nkwa bịakwasị ha. 43A ga-azụkwa ọhịa* nʼala a unu na-asị na ọ bụ ala tọgbọrọ nʼefu, nke mmadụ na anụmanụ na-adịghị nʼime ya, ala nke e nyefere nʼaka ndị Babilọn. 44A ga-ejikwa ọlaọcha zụọ ala ubi, deekwa ihe banyere orire na ọzụzụ ya nʼakwụkwọ. A ga-aka akwụkwọ ndị ahụ akara nʼihu ndị akaebe, nʼala Benjamin, na nʼobodo nta niile dị gburugburu Jerusalem, ma nʼala Juda, na nʼobodo dị nʼala ugwu ugwu, na nke dị na mgbada ugwu niile dị nʼọdịda anyanwụ, na nke dị na Negev, nʼihi na aga m esite nʼobodo ndị ahụ dọtara ha nʼagha buuru ha gaa kpọlata ha.* Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.” 32:43 Ya bụ, ala ubi 32:44 Maọbụ, m ga-eweghachitere ha ihe onwunwe ha

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.