Native Bible

Jeremiah 3:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼụbọchị ahụ ndị Juda ga-adịnyere ndị Izrel, ha abụọ ga-ejikọta aka site nʼala ahụ dị nʼugwu bịa nʼala nke m nyere nna nna unu dịka ihe nketa.”

Jeremiah 3:18 in English

Jeremiah 3:18 · Berean Standard Bible

In those days the house of Judah will walk with the house of Israel, and they will come together from the land of the north to the land that I gave to your fathers as an inheritance.

Context

16Nʼụbọchị ahụ, mgbe ọnụọgụgụ unu mụbara dị ukwuu nʼala ahụ,” otu ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “ndị mmadụ agaghị asịkwa ọzọ, ‘igbe ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị.’ Ọ gaghị abakwa ha nʼobi maọbụ ha echeta ya; ọ gaghị adịkwa ha mkpa maọbụ emepụtakwa ọzọ. 17Mgbe oge ahụ ruru, aha a ga-akpọ Jerusalem bụ Ocheeze Onyenwe anyị. Mba niile kwa ga-ezukọta nʼebe ahụ ife m ofufe. Ha agakwaghị agbaso echiche obi ọjọọ ha. 18Nʼụbọchị ahụ ndị Juda ga-adịnyere ndị Izrel, ha abụọ ga-ejikọta aka site nʼala ahụ dị nʼugwu bịa nʼala nke m nyere nna nna unu dịka ihe nketa.” 19“Mụ onwe m kwuru sị, “ ‘Lee ka ọ ga-esi masị m imeso unu mmeso dịka unu bụ ụmụ m ndị ikom, nye unu ala dị mma nke ga-ewetara unu ọṅụ, nke bụ ihe nketa kachasị mma na mba niile.’ Ana m eche na unu ga-akpọ m ‘Nna’ ma hapụ iwezuga onwe unu site nʼịgbaso m. 20Ma dịka nwunye na-ekwesighị ntụkwasị obi, i gosila onwe gị, O Izrel na ị bụ onye a na-ekwesighị ịtụkwasị obi” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.