Jeremaya 3:14
Jeremiah 3:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Lọghachinụ unu ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, “nʼihi abụ m di unu. M ga-ahọrọ unu, otu onye site nʼotu obodo na mmadụ abụọ site nʼotu agbụrụ. M ga-akpọghachi unu Zayọn.
Jeremiah 3:14 in English
Jeremiah 3:14 · Berean Standard Bible
“Return, O faithless children,” declares the LORD, “for I am your master, and I will take you—one from a city and two from a family—and bring you to Zion.
Context
12Gaa, kwusaa ozi a nʼụzọ ugwu, na-asị,
“ ‘Lọta, gị Izrel nke na-ekwesighị ntụkwasị obi,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
‘Agaghị m ewesokwa gị iwe ọzọ,
nʼihi na abụ m onye obi ebere,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
‘Agaghị m ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi. 13Naanị nabata na ị bụ onye ikpe mara,
na i nupula isi megide Onyenwe anyị, bụ Chineke gị.
Kwupụta na i werela onwe gị kesara ndị mba ọzọ dị iche iche
nʼokpuru osisi ndụ niile,
na ị jụkwara irubere m isi.’ ”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 14“Lọghachinụ unu ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, “nʼihi abụ m di unu. M ga-ahọrọ unu, otu onye site nʼotu obodo na mmadụ abụọ site nʼotu agbụrụ. M ga-akpọghachi unu Zayọn. 15Mgbe ahụ, aga m enye unu ndị ọzụzụ atụrụ masịrị m, ndị ga-eji amamihe na nghọta duo unu. 16Nʼụbọchị ahụ, mgbe ọnụọgụgụ unu mụbara dị ukwuu nʼala ahụ,” otu ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “ndị mmadụ agaghị asịkwa ọzọ, ‘igbe ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị.’ Ọ gaghị abakwa ha nʼobi maọbụ ha echeta ya; ọ gaghị adịkwa ha mkpa maọbụ emepụtakwa ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.