Native Bible

Jeremiah 3:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, aga m enye unu ndị ọzụzụ atụrụ masịrị m, ndị ga-eji amamihe na nghọta duo unu.

Jeremiah 3:15 in English

Jeremiah 3:15 · Berean Standard Bible

Then I will give you shepherds after My own heart, who will feed you with knowledge and understanding.”

Context

13Naanị nabata na ị bụ onye ikpe mara, na i nupula isi megide Onyenwe anyị, bụ Chineke gị. Kwupụta na i werela onwe gị kesara ndị mba ọzọ dị iche iche nʼokpuru osisi ndụ niile, na ị jụkwara irubere m isi.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 14“Lọghachinụ unu ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, “nʼihi abụ m di unu. M ga-ahọrọ unu, otu onye site nʼotu obodo na mmadụ abụọ site nʼotu agbụrụ. M ga-akpọghachi unu Zayọn. 15Mgbe ahụ, aga m enye unu ndị ọzụzụ atụrụ masịrị m, ndị ga-eji amamihe na nghọta duo unu. 16Nʼụbọchị ahụ, mgbe ọnụọgụgụ unu mụbara dị ukwuu nʼala ahụ,” otu ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “ndị mmadụ agaghị asịkwa ọzọ, ‘igbe ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị.’ Ọ gaghị abakwa ha nʼobi maọbụ ha echeta ya; ọ gaghị adịkwa ha mkpa maọbụ emepụtakwa ọzọ. 17Mgbe oge ahụ ruru, aha a ga-akpọ Jerusalem bụ Ocheeze Onyenwe anyị. Mba niile kwa ga-ezukọta nʼebe ahụ ife m ofufe. Ha agakwaghị agbaso echiche obi ọjọọ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.