Jeremaya 3:12
Jeremiah 3:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gaa, kwusaa ozi a nʼụzọ ugwu, na-asị, “ ‘Lọta, gị Izrel nke na-ekwesighị ntụkwasị obi,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewesokwa gị iwe ọzọ, nʼihi na abụ m onye obi ebere,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi.
Jeremiah 3:12 in English
Jeremiah 3:12 · Berean Standard Bible
Go, proclaim this message toward the north: ‘Return, O faithless Israel,’ declares the LORD. ‘I will no longer look on you with anger, for I am merciful,’ declares the LORD. ‘I will not be angry forever.
Context
10Nʼagbanyeghị nke a, nwanne ya nwanyị nke na-ekwesighị ntụkwasị obi, bụ Juda ejighị obi ya lọghachikwute m, maọbụ naanị nlọghachi aghụghọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 11Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Izrel na-adaghachi azụ na-egosi onwe ya nʼonye ezi omume karịa Juda onye na-aghọ aghụghọ. 12Gaa, kwusaa ozi a nʼụzọ ugwu, na-asị,
“ ‘Lọta, gị Izrel nke na-ekwesighị ntụkwasị obi,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
‘Agaghị m ewesokwa gị iwe ọzọ,
nʼihi na abụ m onye obi ebere,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
‘Agaghị m ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi. 13Naanị nabata na ị bụ onye ikpe mara,
na i nupula isi megide Onyenwe anyị, bụ Chineke gị.
Kwupụta na i werela onwe gị kesara ndị mba ọzọ dị iche iche
nʼokpuru osisi ndụ niile,
na ị jụkwara irubere m isi.’ ”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 14“Lọghachinụ unu ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, “nʼihi abụ m di unu. M ga-ahọrọ unu, otu onye site nʼotu obodo na mmadụ abụọ site nʼotu agbụrụ. M ga-akpọghachi unu Zayọn.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.