Jeremaya 3:11
Jeremiah 3:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Izrel na-adaghachi azụ na-egosi onwe ya nʼonye ezi omume karịa Juda onye na-aghọ aghụghọ.
Jeremiah 3:11 in English
Jeremiah 3:11 · Berean Standard Bible
And the LORD said to me, “Faithless Israel has shown herself more righteous than unfaithful Judah.
Context
9Ma nke a emeghị ka ihere mee ya. O merụọla ala, ọ na-akwakwa iko site nʼife nkume na osisi. 10Nʼagbanyeghị nke a, nwanne ya nwanyị nke na-ekwesighị ntụkwasị obi, bụ Juda ejighị obi ya lọghachikwute m, maọbụ naanị nlọghachi aghụghọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 11Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Izrel na-adaghachi azụ na-egosi onwe ya nʼonye ezi omume karịa Juda onye na-aghọ aghụghọ. 12Gaa, kwusaa ozi a nʼụzọ ugwu, na-asị,
“ ‘Lọta, gị Izrel nke na-ekwesighị ntụkwasị obi,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
‘Agaghị m ewesokwa gị iwe ọzọ,
nʼihi na abụ m onye obi ebere,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
‘Agaghị m ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi. 13Naanị nabata na ị bụ onye ikpe mara,
na i nupula isi megide Onyenwe anyị, bụ Chineke gị.
Kwupụta na i werela onwe gị kesara ndị mba ọzọ dị iche iche
nʼokpuru osisi ndụ niile,
na ị jụkwara irubere m isi.’ ”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.