Native Bible

Jeremiah 3:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nke a emeghị ka ihere mee ya. O merụọla ala, ọ na-akwakwa iko site nʼife nkume na osisi.

Jeremiah 3:9 in English

Jeremiah 3:9 · Berean Standard Bible

Indifferent to her own infidelity, Israel had defiled the land and committed adultery with stones and trees.

Context

7Echere m na mgbe o mesịrị ihe ndị a niile na ọ ga-alọghachikwute m, ma ọ lọtaghị. Nwanne ya nwanyị bụ Juda, onye na-ekwesighị ntụkwasị obi hụkwara ya. 8Enyere m Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi akwụkwọ alụkwaghị m, chụpụ ya nʼihi ndụ ịkwa iko ya, ma lee na nwanne ya nwanyị onye na-ekwesịkwaghị ntụkwasị obi bụ Juda atụghị egwu. Ọ gakwara nʼihu ịkwa iko. 9Ma nke a emeghị ka ihere mee ya. O merụọla ala, ọ na-akwakwa iko site nʼife nkume na osisi. 10Nʼagbanyeghị nke a, nwanne ya nwanyị nke na-ekwesighị ntụkwasị obi, bụ Juda ejighị obi ya lọghachikwute m, maọbụ naanị nlọghachi aghụghọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 11Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Izrel na-adaghachi azụ na-egosi onwe ya nʼonye ezi omume karịa Juda onye na-aghọ aghụghọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.