Jeremaya 28:6
Jeremiah 28:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jeremaya onye amụma sịrị, “Amen!* Ka Onyenwe anyị mezuo okwu amụma a i buru site na ibughachite ngwongwo ụlọ Onyenwe anyị na ịkpọghachite ndị niile e mere ka ha si nʼebe a gaa biri na Babilọn.
Jeremiah 28:6 in English
Jeremiah 28:6 · Berean Standard Bible
“Amen!” Jeremiah said. “May the LORD do so! May the LORD fulfill the words you have prophesied, and may He restore the articles of His house and all the exiles back to this place from Babylon.
Context
4Aga m akpọlatakwa Jehoiakin nwa Jehoiakim, na ndị niile ọzọ e si na Juda dọta nʼagha bulaa Babilọn, nʼihi na aga m agbaji agbụ ahụ eze Babilọn nyanyere ha nʼolu.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 5Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma zara Hananaya onye amụma nʼihu ndị nchụaja na ndị mmadụ niile guzo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị 6Jeremaya onye amụma sịrị, “Amen!* Ka Onyenwe anyị mezuo okwu amụma a i buru site na ibughachite ngwongwo ụlọ Onyenwe anyị na ịkpọghachite ndị niile e mere ka ha si nʼebe a gaa biri na Babilọn. 7Ma gee ntị nụrụ ihe m ga-ekwu nʼihu gị na nʼihu ndị a niile guzo nʼebe a. 8Site na mgbe ochie, ndị amụma ahụ bu mụ na gị ụzọ ebuola amụma banyere agha na mbibi na ọrịa na-efe efe megide ọtụtụ obodo dị iche iche, na ọtụtụ alaeze dị iche iche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.