Jeremaya 28:5
Jeremiah 28:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma zara Hananaya onye amụma nʼihu ndị nchụaja na ndị mmadụ niile guzo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị
Jeremiah 28:5 in English
Jeremiah 28:5 · Berean Standard Bible
Then the prophet Jeremiah replied to the prophet Hananiah in the presence of the priests and all the people who were standing in the house of the LORD.
Context
3Tupu afọ abụọ agabiga, aga m esi Babilọn bulata ihe ndị ahụ niile Nebukadneza eze Babilọn si nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bupụ bulaa Babilọn. 4Aga m akpọlatakwa Jehoiakin nwa Jehoiakim, na ndị niile ọzọ e si na Juda dọta nʼagha bulaa Babilọn, nʼihi na aga m agbaji agbụ ahụ eze Babilọn nyanyere ha nʼolu.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 5Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma zara Hananaya onye amụma nʼihu ndị nchụaja na ndị mmadụ niile guzo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị 6Jeremaya onye amụma sịrị, “Amen!* Ka Onyenwe anyị mezuo okwu amụma a i buru site na ibughachite ngwongwo ụlọ Onyenwe anyị na ịkpọghachite ndị niile e mere ka ha si nʼebe a gaa biri na Babilọn. 7Ma gee ntị nụrụ ihe m ga-ekwu nʼihu gị na nʼihu ndị a niile guzo nʼebe a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.