Native Bible

Jeremiah 28:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Site na mgbe ochie, ndị amụma ahụ bu mụ na gị ụzọ ebuola amụma banyere agha na mbibi na ọrịa na-efe efe megide ọtụtụ obodo dị iche iche, na ọtụtụ alaeze dị iche iche.

Jeremiah 28:8 in English

Jeremiah 28:8 · Berean Standard Bible

The prophets of old who preceded you and me prophesied war, disaster, and plague against many lands and great kingdoms.

Context

6Jeremaya onye amụma sịrị, “Amen!* Ka Onyenwe anyị mezuo okwu amụma a i buru site na ibughachite ngwongwo ụlọ Onyenwe anyị na ịkpọghachite ndị niile e mere ka ha si nʼebe a gaa biri na Babilọn. 7Ma gee ntị nụrụ ihe m ga-ekwu nʼihu gị na nʼihu ndị a niile guzo nʼebe a. 8Site na mgbe ochie, ndị amụma ahụ bu mụ na gị ụzọ ebuola amụma banyere agha na mbibi na ọrịa na-efe efe megide ọtụtụ obodo dị iche iche, na ọtụtụ alaeze dị iche iche. 9Ma ihe e ji amata na ọ bụ Onyenwe anyị nʼezie, zitere onye amụma buru amụma kwuo na udo ga-adị, bụ naanị ma ọ bụrụ na amụma ya emezuo.” 10Mgbe ahụ, Hananaya bụ onye amụma yipụrụ Jeremaya agbụ ahụ o yikwasịrị onwe ya nʼolu gbajie ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.