Native Bible

Jeremiah 18:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọzọ, ọ bụrụ na m akpọsaa na a ga-ewuli mba ọbụla maọbụ alaeze ọbụla elu, kụọkwa ya,

Jeremiah 18:9 in English

Jeremiah 18:9 · Berean Standard Bible

And if at another time I announce that I will build up and establish a nation or kingdom,

Context

7Mgbe ọbụla m kpọsara na a ga-akwada maọbụ bibie, maọbụ si nʼọnọdụ ya hopu mba maọbụ alaeze ọbụla, 8ọ bụrụ na mba ahụ m dọrọ aka na ntị esite na mmehie ha chegharịa, a gaghị ebibi ya dịka m si zube. 9Ọzọ, ọ bụrụ na m akpọsaa na a ga-ewuli mba ọbụla maọbụ alaeze ọbụla elu, kụọkwa ya, 10ọ bụrụ na o mee ihe jọrọ njọ nʼanya m, jụ irubere m isi, agaghị m emere ya ihe ọma ahụ m zubere imere ya. 11“Ugbu a, gwa ndị Juda na ndị ahụ bi na Jerusalem, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Lee, ana m akwado mbibi nke ga-abịakwasị unu; ana m echekwa echiche ọjọọ megide unu. Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu site nʼụzọ ọjọọ ya chegharịa, ya meekwa ka ụzọ ya na omume ya zie ezi.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.