Native Bible

Jeremiah 18:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ọ bụrụ na mba ahụ m dọrọ aka na ntị esite na mmehie ha chegharịa, a gaghị ebibi ya dịka m si zube.

Jeremiah 18:8 in English

Jeremiah 18:8 · Berean Standard Bible

But if that nation I warned turns from its evil, then I will relent of the disaster I had planned to bring.

Context

6Ọ sịrị, “Ọ bụ na m apụghị ime unu dịka ọkpụ ite a mere, unu ụmụ Izrel?” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Dịka ụrọ si dị nʼaka ọkpụ ite ahụ, otu a ka unu onwe unu si dịrị nʼaka m, gị Izrel. 7Mgbe ọbụla m kpọsara na a ga-akwada maọbụ bibie, maọbụ si nʼọnọdụ ya hopu mba maọbụ alaeze ọbụla, 8ọ bụrụ na mba ahụ m dọrọ aka na ntị esite na mmehie ha chegharịa, a gaghị ebibi ya dịka m si zube. 9Ọzọ, ọ bụrụ na m akpọsaa na a ga-ewuli mba ọbụla maọbụ alaeze ọbụla elu, kụọkwa ya, 10ọ bụrụ na o mee ihe jọrọ njọ nʼanya m, jụ irubere m isi, agaghị m emere ya ihe ọma ahụ m zubere imere ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.